ILU METỤTARA NKWỤ NA AKWỤ N’ALA IGBO
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
ISSN 2672-4243
Authors
- Onyinye Constance Amamgbo Corresponding author
Abstract
Ụmị edemedeNkwụ bụ otu n’ime osisi ndị Igbo ji eme ọnụ. Nke a na-egosị na ọ bụ isi sekpụ ntị n’osisi e nwere n’ala Igbo. Ọ bụ na nkwụ ka e si enweta akwụ e ji esi nri niile a na-esi n’ala Igbo. Ọbụ mkpa a akwụ na nkwụ dị kpalitere mmụọ nwa nchọcha ileba anya n’isi okwu a bụ “Ilu Metụtara Nkwụ na Akwụ N’Ala Igbo”. Otu n’ime ebumnuche nchọcha a bụ ime ka a mata na e nwere ilu Igbo ndị na-arụtụ aka na nkwụ na akwụ. Ebumnuuche nke abụọ bụ ịkpọsa ilu ndị ahụ na-emetụta nkwụ na akwụ. Nke atọ bụ ime ka a mata mgbe e ji webata ilu ndịa n’okwu Igbo. Atụtụ nchọcha bụ atụtụ njieme. Usoro nwa nchọcha ji eme nchọcha a bụusoro nkọwasị. Otu n’ime nchọpụta nchọcha a bụ na ilu Igbo gbasara agbasa ka ụkpaka. Nchọpụta nke abụọ na-egosị na, site n’ilu Igbo, nkwụ na akwụ baara ndị Igbo ọtụtụ uru. A chọpụtakwara na nchọcha a ga-abara ụmụ akwụkwọ, ndị nkuzi na ndị Igbo niile uru. N’ikpeazụ, nwa nchọcha mejupụtara ebumnuuche ya site n’ime ka nwaafọ Igbo ọ bụla mata na ilu Igbo bụ ihe metụtara akụkụ dị iche iche nke ọ bụ naanị onye chemiri echiche ime ga-eji ya rụọ ọrụ. Na nchịkọta, nchọcha a ga-enyere ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi, ọhanaeze aka ịmata mkpa ilu dị na etu o siri metụta osisi ụfọdụ e nwere n’ala Igbo. Nwa nchọcha na atụ aro ka obodo ọ bụla dị n’ala Igbo jiri osisi ọ bụla ha nwere were kpọrọ ihe