TJS TurboFlux Journal System TurboFlux Journal System

ODEZURUIGBO JOURNAL

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Nigeria

Open Access Peer Reviewed ISSN: 2672-4243
Research article open Vol. 4 No. 1 (2020)

NJIKỌRỌ AGWA NA NDỊNA N’ONYE KPAA NKỤ AHỤHỤ NA AMAECHINA

Chiọma M. Akaeze, Sọpụrụchị C. Abọh, Augustina N. Eze, Juliana G. Mamah · Pages 63-80 · August 14, 2020

ISSN 2672-4243

Authors

  • Chiọma M. Akaeze Corresponding author
  • Sọpụrụchị C. Abọh
  • Augustina N. Eze
  • Juliana G. Mamah

Abstract

Ọrụ nchọcha a lebara anya na njikọrọ agwa na ndịna n’ejije Onye Kpaa Nkụ Ahụhụ na Amaechina. Ebumnuche nchọcha a bụ ịmata njikọrọ agwa na ndịnaisiokwu ma ọ bụ ndịnaya n’Onye Kpaa Nkụ Ahụhụ na Amaechina nakwa inyocha ka ndị odee si were kpụọ agwa n’ejije ha dị ka ha si bụrụ nwoke na nwaanyị. Nchọcha a gbasoro usoro nkenụdị agwa site n’ọnọdụ agwa weere n’ejije (agwa ukwu na agwa nta) nakwa echiche Woolf na Beauvoir gbasara jenda odee na akparamagwa agwa nwoke na nwaanyị nọ n’ejije were tụchaa njatụle sitere n’ejije abụọ ndị e ji rụọ ọrụ. A chọpụtara na e nwere ihe jikọrọ agwa na ndịnaya nke bụ na ha abụọ na-ejikọ aka ọnụ ewepụta mbunuche odee nakwa nhazi ndị odee. A chọpụtakwara na odee nwere ike isite n’ọkpụkpụ agwa ya n’ejije gosipụta ụdị mmadụ ọ bụ dị ka nwoke maọbụ nwaanyị. A hụtara na ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị odee na-esite n’ọkpụkpụ agwa dị n’ejije gosipụta ụdị mmadụ ha bụ dị ka nwoke maọbụ nwaanyị mana nke a anaghị apụtacha ihe oge ọbụla maka Onye Kpaa Nkụ Ahụhụ akwadoghị echiche a. Odee bụ nwoke mana agwa ndị agwa ha dị njọ bụ ụmụnwoke ebe e nyere agwa ndị nwaanyị ezi akparamagwa. N’aka nke ọzọ, Amaechina dabara n’echiche Woolf na Simeone. A chịkọtara na ọ bụghị ọrụ agụmagụ niile ka echiche Woolf na Beauvoir na-adaba. Ndị nchọcha ọzọ nwere ike ịgbaso usoro ọzọ n’ịtụcha agwa na ndịna n’ejije Igbo.

Keywords

Ejije, Feminizim, Agwa ukwu, Agwa nta, Agụmagụ

How to cite

No formats match your search.

Pick a style from the searchable list. Download uses the format currently selected.

Reference managers: RIS · BibTeX · EndNote

In-text (APA): (Akaeze et al., 2020) · Akaeze et al. (2020)