TJS TurboFlux Journal System TurboFlux Journal System

ODEZURUIGBO JOURNAL

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Nigeria

Open Access Peer Reviewed ISSN: 2672-4243
Research article open Vol. 4 No. 1 (2020)

NJIAMAATỤ N’AKWỤKWỌ AGỤMAGỤ IGBO: NNYOCHA ALA BINGO NA ELELỊA NA IHE O MERE

Edith U. Nwobu, Precious O. Akidi · Pages 48-62 · August 14, 2020

ISSN 2672-4243

Authors

  • Edith U. Nwobu Corresponding author
  • Precious O. Akidi

Abstract

Nchọcha a bụ maka nnyocha njiamaatụ n’agụmagụ Igbo, site n’ịgbado ụkwụ n’Ala Bingo na Elelịa Na Ihe O mere, nke D. N. Achara dere. Nchọcha a bụ nke ebumnuche ya bụ igosipụta ụzọ dị iche iche odee si esite n’agwa na echiche dị iche iche pụtagasịrị ìhè n’akwụkwọ abụọ ndị a zipụta mmetụta njiamaatụ n’ụwa a na-ahụ anya. N’ụwa a na-ahụ anya, ọtụtụ agwa na-arụ ọrụ na ya. ọ bụ ya kpatara nchọcha a jiri bụrụ nchọcha ntinye n’ọrụ. N’iji mee nchọcha a n’etu dị mma, a na-agbaso atụtụ njiamaatụ n’ịtụcha ngwa nchọcha. Agwa ndị ahụ gụnyere nke Eze ọgara ọrụ n’afọ lọta n’afọ, ọgụ, Mgba, Nnụnụ, Afọ Afọ, Atimkpara, ọkpụ nkọ ntị, Elelịa na Eze amaghị ihe ọma. Nchọpụta nchọcha a na-egosi na agwa ndị a si n’agụmagụ abụọ a na-ezipụta njiamaatụ ihe ndị na-eme n’ụwa. A chọpụtakwara na odee zipụtara echiche dị iche iche ndị gụnyere; amamihe, ogologo ntachi obi, mpako, ọhụ, ihu ọma, mmegbu iji mee ka a hụ na ndị odee ji agụmagụ ha eme ugegbe ihe na-eme n’ụwa mmadụ.

How to cite

No formats match your search.

Pick a style from the searchable list. Download uses the format currently selected.

Reference managers: RIS · BibTeX · EndNote

In-text (APA): (Nwobu & Akidi, 2020) · Nwobu and Akidi (2020)