TJS TurboFlux Journal System TurboFlux Journal System

ODEZURUIGBO JOURNAL

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Nigeria

Open Access Peer Reviewed ISSN: 2672-4243
Research article open Vol. 5 No. 1 (2021)

ASỊNILU ỤMỤ ANỤMANỤ NA NSIRIHỤ NDỊ IGBO: NZIPỤTA ỌWA ECHICHE HA NWERE N’USORO AMỤMAMỤ NCHEKE

Florence Uju Ibeh PhD, Ifeyinwa Cordelia Isidienu PhD · Pages 1-19 · December 11, 2022

ISSN 2672-4243

Authors

  • Florence Uju Ibeh PhD Corresponding author
  • Ifeyinwa Cordelia Isidienu PhD

Abstract

Ụmị edemede Nchọcha a bụ ntụcha agwara na njirimara asịnilu ụmụ anụmanụ na nsirihụ ndị Igbo n’usoro amụmamụ asụsụ ncheke. Amụmamụ asụsụ ncheke bụ amụmamụ na-elekwasị anya na nghọta. Ọ na- achọ ịmata ka mmadụ si echedebe echiche. Asịnilu so na mbụrụ n’amụmamụ ncheke ma bụrụ atụmatụ okwu na-adị n’ụdị okwu ozi nke a na-asị n’otu onye ma ọ bụ otu ihe kwuru otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ. Ihe na-ekwu ihe ahụ nwere ike ịbụ ihe na-eku ume ma ọ bụ ihe anaghi eku ume. Ihe kpalitere nchọcha a bụ na o nwebeghi ebe nwa nchọcha hụrụla e ji atụtụ ọwa echiche mee nchọcha n’asịnilu. Ebumnobi nchọcha a bụ ịkọwa asịnilu, njirimara ya na ịchọpụta ọwa echiche a ga-eji kọwapụta asịnilu ụmụ anụmanụ a họọrọ. Usoro nchọcha a bụ sọeveekenkọwasị. E wetara ngwa ọrụ nchọcha a n’akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche, ajụjụ ọnụ a gbakwara ụfọdụ ndị mmadụ tinyere iji usoro nnọrọmele na ijikwa ọgụgụ isi dị ka ndị Igbo chepụta ụfọdụ ngwa ọrụ. Atụtụ e jiri mee nchọcha a bụ atụtụ ndịna ncheke. Ka e mechara ntụcha, e si na nkọwa asịnilu hụ ndịiche ya na ilu. Nchọpụta ọzọ bụ na e si n’agwara na njirimara anụmanụ wube asịnilu e jiri anụmanụ ndị a tụọ nke mere na anụ a sị na ọ sịrị, na adị ka ọ sịrị ihe ahụ n’eziokwu. Ọzọ bụ na atụtụ nhụta kọwara ọwa echiche mfe atọ pụtara ihe n’asịnilu e jiri mee nchọcha. Ha bụ ọwa ndịnime, ndịnike na ndịnụzọ. Nchọcha a ga-abara ndịnchọcha, ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ uru. Maka nhịamahụ e nwetara n’ịtapịa ụfọdụ n’Igbo kanchọcha a ji atụ aro ka ndị nwere mmasị n’ịmụ asụsụ Igbo gaa n’ihu n’ iji atụtụ a mekwuonchọcha ka ihe ndị e merela na ya bawanyekwuo.

How to cite

No formats match your search.

Pick a style from the searchable list. Download uses the format currently selected.

Reference managers: RIS · BibTeX · EndNote

In-text (APA): (PhD & PhD, 2022) · PhD and PhD (2022)