TJS TurboFlux Journal System TurboFlux Journal System

ODEZURUIGBO JOURNAL

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Nigeria

Open Access Peer Reviewed ISSN: 2672-4243
Research article open Vol. 4 No. 1 (2020)

ỊGBA N’IRO NA MMETỌ UGWU NWAANYỊ N’AKWỤKWỌ NDỊ A HỌỌRỌ

Judith Chinenye Okafor, Chidimma Anthonia Ejioforbiri · Pages 31-47 · August 14, 2020

ISSN 2672-4243

Authors

  • Judith Chinenye Okafor Corresponding author
  • Chidimma Anthonia Ejioforbiri

Abstract

Alụmalụ bụ ezi njikọ juputara n’udo, ịhụnanya na anụrị. Mana n’ụwa anyị nọ taa, njikọ a bụzị nke juputara n’ọgbaaghara na katakata. Nke a bụ n’ihi nnukwu ajọ agwa ịgba n’iro nke ụfọdụ ụmụ nwaanyị lụrụ di na-akpa. Nchọcha a lebara anya n’inyochapụta ọnọdụ ịgba n’iro di ka o si pụta ihe n’Isi Akwụ Dara N’Ala, na Onye Chi Ya Akwatughi. Ebumnuche anyị bụ ịchọpụta ihe na-ebute ọnọdụ dị otu a. Ọzọ bụ ịchọpụta ụdị nsogbu na-esi n’ịgba n’iro apụta. Ebumnuche ọzọ bụ ịchọpụta ụzọ a ga-esi gbochilata agwa dị otu a n’ala Igbo. Usoro a gbasoro wee mee nchọcha a bụ usoro sọvee. E ji Atụtụ Nnyocha Akparamagwa wee nyochaa akwụkwọ agụmagụ ndị a họọrọ. Anyị chọpụtara na ihe na-ebute ọnọdụ di otu a bụ nsogbu na-adapụtara mmadu, oke ọchịchọ na enweghi ndidi. Nsogbu ịgba n’iro na-ebute dị ka nchọcha a si chọpụta bụ ihe isiike, mkpụtọ ugwu na ajọ ndụ. Etu a ga-esi gbochilata nsogbu ndị a bụ site n’ịgba alụkwaghịm, di na nwunye inwe ezi ịhụnanya n’etiti onwe ha nakwa nwoke na nwaanyị chọrọ ịbanye n’alụmalụ inwe ezi mmụta banyere alụmalụ ma ghọta ọkwa ahụ ha na-achọ ịbanye na ya nke ọma tupu ha abanye. Nchọcha a ga- abara ọha mmadụ uru ime ka ha mata na ọnọdụ mmadụ nọ na ya nwere ike ime ya ka o kpaa agwa o tosịghị ịkpa. Ọ ga-enyekwara ndị alụbeghị di aka ịmata na alụmalụ abụghị egwu achị ụtaba n’aka agba. Nke a ga-eme ka ha ghọta nke ọma ihe ọ putara tupu ha abanye na ya. Ọ ga-enyekwara ndị na-akpa ụdi agwa a aka ịmata na ọ bụghị etu akị ilu si ada na ntị ka o si atọ.

How to cite

No formats match your search.

Pick a style from the searchable list. Download uses the format currently selected.

Reference managers: RIS · BibTeX · EndNote

In-text (APA): (Okafor & Ejioforbiri, 2020) · Okafor and Ejioforbiri (2020)