Amụtaghị Nwa n’Alụmdi Na Nwunye n’Ala Igbo: Ọnọdụ ya n’Iduuazị A Họọrọ
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
ISSN 2672-4243
Authors
- Winifred Chiazo Okeke Corresponding author
- Nonyelum Joy Moghalu (PhD)
Abstract
Ụmị edemedeỌmụmụ bụ ọrụ na ngọzi pụrụ iche na-esite n’ Alụmdi na Nwunye apụta nke bụ otu ụzọ agbụrụsi abawanye. Amụtaghị nwa bụ otu ihe na-eme alụmalụ ọ dị ka nke ihe ụtọ na-adịghị na ya, nke a bụ n’ihi ọtụtụ ihe nhujuanya di na nwunye na-enweta n’aka mmadụ ọha obodo na tinyere ka omenala. Ebumnobi nchọcha a bụ/ịchọpụta ihe ndị na-ebute ọnọdụ amụtaghị nwa, ọzọbụịchọpụta ụzọ ndị ahụ dị iche iche Amụtaghị nwa si ewetara di na nwunye ihe mgbu na mmekpaahụ, ịchọpụta ụzọ a ga-esi gbochie nsogbu ọnọdụamụtaghị nwa na-eweta n’ alụmdi na nwunye. A gbasoro usoro sọveee wee mee nchọcha a, ma were atụtụ usoro Ezinaụlọ nke Bowen n’afọ 1950 wee nyocha akwụkwọ agụmagụ ndị a họọrọ; Onye Chi Ya Akwụtaghị na Otu Iko mmanya M Ñụrụ Afọ Asaa. A chọpụtara na ihe ndị na-ebute ọnọdụ amụtaghị nwa na-abụ site n’ekerechi, akparamagwa ọjọọ, na etozughị oke n’ihe ndị ahụ e ji abụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị.Nchọcha a zipụtakwara nsogbu dị iche iche amụtaghị nwa na-eweta n’ọnọdụ Alụmdi na Nwunye, ma tinyekwa aro ka di na nwunye bi na ezinaụlọ nwee ike inwe mmasị ịkute nwa.Nchọcha a ga-abara ndị ntọrọbịa, ọha mmadụ, ezinaụlọ niile kachasi ndị n’ọnọdụAmụtaghịnwa uru site n’inye ntuziaka etu a gas-esi gbochcie nsogbu amụtaghị nwa.