TJS TurboFlux Journal System TurboFlux Journal System

Odibendi

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Nigeria

Open Access Peer Reviewed
Research article open Vol. 1 No. 1 (2020)

IJELE: AKAMGBA CHERE YA DỊ KA MMỌNWỤ NA ỌRỤ NKA NDỊ IGBO

PhD Charles Azụbụike Nneke · Pages 120-131 · December 15, 2022

Authors

  • PhD Charles Azụbụike Nneke Corresponding author

Abstract

Ụmị Edemede
Ijele dị ka mmọnwụ na ọrụnka pụtara ihe nke ukwuu na ndụ ndị Igbo. Ọ bụ etu ahụ ka o sinwe ọtụtụ akamgba chere ya n‘ihi na ọ bụ ka onye ha ka isi na-awa ya ha. E si n‘edemedenchọcha a wee lebaa anya n‘akamgba chere mmọnwụ Ijele, bụ ndị na-eme ka ọ daa ada. Hagụyere: ikuku, ozizo mmiri, na anwansị dị ka ịkọ nsị na ife ajụ. N‘aka nke ọzọ usoro obibindụ ọgbara ọhụụ dị ka ekpemekpe, agụmakwụkwọ na ọrụ Bekee nke enyeghi ụmụ Igbonwere mmasị n‘etim mmọnwụ ohere. Ebumnuche e ji bagide edemede a bụ ka e si na yawee leghachi anya azụ n‘ihe mere n‘ọrụnka na mmọnwụ bụ Ijele n‘ebe o metụtara ọnọdụ yana ndụ ndị Igbo. Ọ bụ n‘ihi nke a ka o ji dị mkpa na e lebara anya n‘ọdachi ndị a ma chọpụtaụzọ ọgbara ọhụụ a ga-esi wee gbochie ha. N‘otu aka ahụ e si n‘edemede a wee na-enyeakamgba ndị a chere Ijele ọnọdụ kwesịrị ya n‘etiti edemede ndị ọzọ e derela maka mmọnwụIjele iji bawaye agụmagụ banyere ya. N‘ụzọ pụrụ iche ka e si n‘edemede a zipụtara ọhanezeakamgba ndị ahụ chere ya. E mere nchọcha a n‘agụmagụ ọdịnala ma bụrụ n‘isiokwu e si naya ezipụta akamgba chere ọrụnka na mmọnwụ bụ Ijele. Ọ bụ site n‘ihe a hụrụ anya, ajụjụọnụ, ọbakwụkwọ na ịntanetị ka e si weta ihe e dere n‘edemede a. Atụtụ e ji wee tụchaaedemede nchọcha a bụ atụtụ mkpọghaobi nke na-ahụ ọrụnka ọbụla dị ka onyinyo naọdịmara zuru mba ọnụ. A tụchara ụsa dị iche iche e nwetara site n‘ihe a hụrụ, ajụjụ ọnụ,ọbakwụkwọ na ịntanetị weta. Nke e si na ha wee chọpụta na e nwere otụtụ ihe mkpọbiụkwụna-agba mgba megide usoro obibi ndụ ndị Igbo n‘ebe o metụtara ọrụnka na mmọnwụ Ijele.Edemede a ga-abara onye ọbụla na ọhaneze uru, ọ kachasị n‘ebe ọ gbasara inwe mmasị nammọnwụ ijele na ọrụnka ya.

How to cite

No formats match your search.

Pick a style from the searchable list. Download uses the format currently selected.

Reference managers: RIS · BibTeX · EndNote

In-text (APA): (Nneke, 2022) · Nneke (2022)