ỊGBAMA IHE ỊRỊBA AMA GAJE IME N’ỌDỊNIIHU DỊ KA A HỤTARA N’AKWỤKWỌ EJIJI IGBO ỤFỌDỤ
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
Authors
- Ph.D. Obiageli Theresa Nsolibe Corresponding author
Abstract
Ụmi edmedeEdemede a gbadoro ụkwụ n‘ibu amụma maọbụ ịgba ama ihe ịrịba ama gaje ime n‘ọdịnihu.Ọ nwere ihe ga-abụ ọ mee, o bụrụ ihe iju anya nye ndị mmadụ. dị ihe dị otu ahụ gụnyereanụụlọ ibido bewe akwa n‘etiti ehihe maọbụ n‘etiti abalị, ikwighikwighi ibe n‘etiti abalị,ụkwụ aka ekpe ịkpọ mmadụ, anya ịdọ mmadụ pem pem pem na ụmụ ihe ndị ọzọ ahụtaghị kaihe dịbu adị. Ime ka ndị mmadụ mata na ụmụ ihe ndị ahụ anaghị eme na nkịtị na o nwere iheọ na-eme ka a mata gaje ime kpaliri mmụọ odee ide n‘isiokwu a maka na ụfọdụ ndi mmadụna-asị na o nweghi ihe ọbụla gaje ime. Odee ji akwụkwọ ejije atọ e dere were nyochaaisiokwu a. Ọ gbasoro usoro nnyocha sọvee. A chọpụtara na ụmụ ihe ụfọdụ na-eme dị kaụmụ nnụnụ ibe n‘etiti ehihie maọbụ abalị, anụ ụlọ ibekwa n‘ụdị oge ahụ, ụkwụ aka ekpeịkpọbi mmadụ na ihe irịba ama ndị ọzọ nwekwara ike e si na nrọ gosi, nwere ihe ha na-agbaama ya gaje ime. Ha na-agba ama ihe ọjọọ maọbụ ihe ọma ga-eme nọdịniihu. Achọpụtakwara na e nwere ike gbochie ihe ọjọọ gaje ime ma a gbaa ama ya n‘ụzọ ndị a ekwuru n‘elu site n‘ije na nke dibịa afa maọbụ na nke ndị ekpere ka ha kwuo ihe a ga-eme ijimedaa ndị mmụọ obi maọbụ kpeere Chukwu ka o gbochie ihe ahụ ka ọ ghara ịbịa nammezu. Edemede a ga-abara ọhanaeze uru site n‘ ime ha Amata na ihe ụfọdụ anaghịanọkata mewe na o nwere ihe na-akpata ya. Nke a ga-eme ha hụ ụdị ihe ahụ ka ha chọọ ụzọigbochi ya ka nsogbu ghara ịdị. Nke a bụ alo a na-atụ n‘ edemede a.